Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ezi Omume? — Ibi Ya Ndụ · Akụkụ Baịbụl KJV Ndị Nwere Nọmba Strong — Ajụjụ Baịbụl
Maka nkọwa ọ bụla dị n'okpuru, họrọ ihe amaokwu ahụ na-akụzi. Akara gị ga-apụta na njedebe.
Nke a bụ ajụjụ a na-enye akara. Gafee ya iji nweta ihe ga-abara gị uru banyere Asambodo Nkwado Ozi Gị.
2 Pita 1:3 — O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị ________ ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya.
mkpa
nʼọnwụ
aha
1 Timoti 3:16 — Karịchasịa nke a, ọ bụ ihe omimi dị ukwuu, bụ ntọala ebe ezi ịdị nsọ si walite: Ọ ________ ihe nʼụdịdị mmadụ, Mmụọ Nsọ gosiri na ọ bụ onye ezi omume, ndị mmụọ ozi hụrụ ya, e kwusara ihe banyere ya nye mba niile, ụwa niile kwenyeere na ya, a nabatakwara ya nʼebube nke eluigwe.
na-enweghị
pụtara
ìhè
1 Pita 2:2 — Dịka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, bụrụnụ ndị agụụ ịṅụ mmiri ara nke Mmụọ Nsọ a na-agwaghị ihe ọbụla na-agụ, ka unu nwee ike site na ya na-eto eto nʼime ________ unu.
nzọpụta
nʼụlọnsọ
Babilọn
Hosiya 11:3 — Ọ bụ mụ onwe m kuziiri ________ otu e si aga ije, ejidere m ha nʼaka m abụọ, ma ha amaghị na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya.
Asịrịa
Ifrem
Sameria
Ndị Hibru 11:6 — Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na ọ dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ________.
họpụtara
ụgwọ
nʼeluigwe
Ọrụ Ndị Ozi 3:2 — Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ ________. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma.
mkpagbu
arịrịọ
enyi
Ọrụ Ndị Ozi 3:8 — Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa ________ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke.
Ijipt
nʼụlọnsọ
Sameria
Jenesis 5:24 — ________ soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.
Hamọ
Enọk
Iiv
Jenesis 6:9 — Nke a bụ akụkọ banyere usoro ndụ Noa na ezinaụlọ ya. Noa bụ onye ezi omume. Onye na-enweghị ịta ________ ọbụla nʼetiti ndị bi nʼoge ya. O mere ihe nʼụzọ Chineke chọrọ ya.
ụta
amara
uru
Jenesis 17:1 — Mgbe ________ gbara iri afọ itoolu na itoolu, Onyenwe anyị gosiri ya onwe ya sị ya, “Abụ m Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Jegharịa ije nʼihu m, bụrụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla.
Ishmel
Ebram
Abimelek
Maika 6:8 — Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma. Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị, Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya, na iji obi dị ________ soro Chineke gị na-eje ije?
umeala
ịdọ
ịhụnanya
Ndị Kọlọsị 1:10 — Ka unu si otu a bie ndụ dị ka Onyenwe anyị chọrọ. Ka unu bụrụkwa ndị na-eme ihe ọma mgbe niile, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ nʼụzọ ọbụla, na ndị na-eto eto nʼihe banyere ________ Chineke mgbe niile.
ịma
ocheeze
ihere
Ndị Galeshịa 5:25 — Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka ________ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi.
ịnya
họpụtara
nzọ
1 Timoti 2:1 — Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ________ nʼisi mmadụ niile
ekele
umeala
ọbịa
1 Timoti 6:6 — Ma ________ Chineke bara uru nke ukwuu nye onye nwere afọ ojuju nʼihe ọbụla o nwere.
ikpere
nkuzi
na-agbaso
Taịtọs 2:12 — Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị ka anyị jụ ndụ asọpụrụghị Chineke na nke ịgbaso ________ ọjọọ dị nʼụwa, kama ka anyị bie ndụ dị ka ndịisi zuruoke na ndụ ezi omume, nakwa ịtụ egwu Chineke nʼọgbọ nke oge a.
ọchịchọ
mmalite
olileanya
1 Timoti 6:11 — Ma gị bụ onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a niile ọsọ. Ma chụsoo ezi omume na iyi Chineke, na okwukwe, na ịhụnanya, na ________, na ịdị nwayọ.
umeala
ntachiobi
nzọpụta
2 Pita 1:6 — tụkwasịkwanụ imerụ ihe nʼoke nʼelu ihe ________, tụkwasịkwanụ ntachiobi nʼelu imerụ ihe na oke, ma na-atụkwasịkwanụ ibi ndụ dị ka ndị Chineke nʼelu ntachiobi.
ọmụma
amara
karịa
1 Timoti 6:12 — Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe gị ike, jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ aka ike bụ nke a kpọrọ gị oku maka ya mgbe i mere ezi ________ gị nʼihu ọtụtụ ndị akaebe.
nkwupụta
nhọpụta
asọpụrụghị
1 Timoti 1:18 — Ugbu a, ________ nwa m, ana m enye gị ndụmọdụ a dị ka amụma ahụ e buru banyere gị nʼoge gara aga si dị. Ka ị site nʼịgbaso ya nwe ike ịlụ ezi ọgụ ahụ.
Gọmọra
Saịlas
Timoti
2 Timoti 2:3 — Soro m ________ oke nʼahụhụ dị ka ezi onye agha Jisọs Kraịst.
arịrịọ
kere
ọbịa
2 Timoti 2:4 — Ọ dịghị onye agha ọbụla na-ekekọta onwe ya nʼihe nke ụwa a, kama ọ na-achọ ime ihe ga-atọ onye ________ ya dị ka onye agha ụtọ.
mụrụ
họpụtara
akụkọ
Ndị Efesọs 6:11 — Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide ________ ọjọọ niile nke ekwensu.
ụtọ
nzube
zụrụ
Ndị Rom 6:13 — Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi ________ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume.
oziọma
nkwa
nʼọnwụ
2 Timoti 3:12 — Nʼezie, ndị niile chọrọ ibi ndụ ịsọpụrụ Chineke nʼime Kraịst Jisọs ga-agabiga ________.
mkpagbu
ịhụnanya
ntachiobi
1 Ndị Kọrint 9:24 — Unu amataghị na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ ________ mpi, ọ bụ naanị otu onye na-enwe ihe onyinye nke mbụ? Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta onyinye ahụ.
Ebram
Jọn
ịsọ
1 Ndị Kọrint 9:25 — Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ________ nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi.
omenaala
ọnwụnwa
ntachiobi
Ndị Hibru 12:1 — Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ________ gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu.
mbilite
ntachiobi
akọnuche
Aịzaya 40:31 — ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ________. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
nʼọgba
ugo
ọlantị
Njikọ ahụ ekopịala
Ọ bụ na ọmụmụ ihe a enyerela gị aka? Kesaa akụkọ nkenke ma ọ bụ akụkọ gị zuru ezu — akụkọ gị ga-enyere onye ọzọ aka ịchọta saịtị a.
Chekwaa ọganihu gị
Ọ bụghị mmanye. Ị chọghị akaụntụ iji jiri saịtị a.
Chekwaa akara ule gị na asambodo gị ọ bụrụ na ị gbanwee ekwentị gị ma ọ bụ hichapụ ndekọ ihuenyo gị.
Weghachite ọganihu
Iweghachi na-agbanwe ọganihu dị na ngwaọrụ a, ọ bụrụkwa na ị bipụta akwụkwọ mmeri mgbe ọ gasịrị, ọ ga-eji aha dị na ndekọ.



