Onye Bụ Jizọs? — Ime Ya N'ezie — Ajụjụ Baịbụl
Maka nkọwa ọ bụla dị n'okpuru, họrọ ihe amaokwu ahụ na-akụzi. Akara gị ga-apụta na njedebe.
Nke a bụ ajụjụ a na-enye akara. Gafee ya iji nweta ihe ga-abara gị uru banyere Asambodo Nkwado Ozi Gị.
Matiu 16:17 — Jisọs gwara ya sị, “Saimọn Pita nwa ________, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya.
Zebedi
Jona
Shealtiel
Jọn 6:44 — O nweghị onye nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụghị na Nna ahụ zitere m kpọtara ya, aga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ________.
mmalite
ọzụzụ
ikpeazụ
Ndị Rom 10:17 — Ma ọ bụ ihe ________ anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst.
guzosie
mụta
doro
1 Pita 2:2 — Dịka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, bụrụnụ ndị agụụ ịṅụ mmiri ara nke Mmụọ Nsọ a na-agwaghị ihe ọbụla na-agụ, ka unu nwee ike site na ya na-eto eto nʼime ________ unu.
nzọpụta
Babilọn
pụrụ
Jọn 17:3 — Nke a bụkwa ndụ ________ ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa.
ama
mmehie
ebighị
Matiu 11:28 — “Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị ________. Aga m enyekwa unu izuike.
ikpere
arọ
aghụghọ
Jọn 10:27 — ________ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m.
ama
Atụrụ
iwu
Ndị Kọlọsị 3:16 — Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ________ nʼobi unu.
kere
ikpe
ekele
Matiu 10:32 — “Ya mere, onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, ka mụ onwe m ga-ekwupụta nʼihu Nna m bi ________.
ọma
nʼeluigwe
nʼanya
Ọrụ Ndị Ozi 5:41 — Mgbe ha hapụrụ ọgbakọ ahụ, ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na-agụnyere ha na ndị ________ ịnara mkparị nʼihi aha ya.
nʼakwụkwọ
kwesiri
ziri
Ndị Rom 12:1 — Ya mere, ________ m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.
ihere
aha
ụmụnna
Ndị Rom 8:35 — Onye nwere ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Kraịst? Ọ bụ nsogbu, ka ọ bụ ihe isi ike, ka ọ bụ ________. Ka ọ bụ ụnwụ, ka ọ bụ ịgba ọtọ, ka ọ bụ ihe egwu, ka ọ bụ mma agha?
mgbapụta
nchegharị
mkpagbu
Matiu 24:42 — “Nʼihi nke a, na-echenụ ________, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.
ga-anọ
nche
ikpere
Mkpughe 1:8 — Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, “Abụ m ________ na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile.”
Tiatira
Alfa
Laodisia
1 Jọn 3:2 — Ndị hụrụ nʼanya, ugbu a anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ________ anyị ga-abụ nʼoge dị nʼihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè, a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nʼihi na anyị ga-ahụ ya dịka ọ dị.
nʼobi
ibe
ọnọdụ
1 Ndị Kọrint 13:12 — Ugbu a, anyị na-ahụ inyogho inyogho dịka anyị ________ anya nʼenyo ma mgbe ahụ anyị ga-ahụ ihu na ihu. Ugbu a, ihe m mara ezughị oke, ma mgbe ahụ aga m amazu, dịka m bụ onye a mazuru.
na-ele
nʼọrụ
chọrọ
Job 19:25 — Amara m na onye ________ m na-adị ndụ, amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ.
mgbapụta
oriọna
inyeaka
Jọn 8:12 — Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ________. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.”
ama
ụwa
mmụọ
Jọn 14:2 — Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m ________ kwadoro unu ebe obibi?
maara
na-aga
na-enye
Njikọ ahụ ekopịala
Ọ bụ na ọmụmụ ihe a enyerela gị aka? Kesaa akụkọ nkenke ma ọ bụ akụkọ gị zuru ezu — akụkọ gị ga-enyere onye ọzọ aka ịchọta saịtị a.
Chekwaa ọganihu gị
Ọ bụghị mmanye. Ị chọghị akaụntụ iji jiri saịtị a.
Chekwaa akara ule gị na asambodo gị ọ bụrụ na ị gbanwee ekwentị gị ma ọ bụ hichapụ ndekọ ihuenyo gị.
Weghachite ọganihu
Iweghachi na-agbanwe ọganihu dị na ngwaọrụ a, ọ bụrụkwa na ị bipụta akwụkwọ mmeri mgbe ọ gasịrị, ọ ga-eji aha dị na ndekọ.



