Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Zọpụta M? — Ọmụmụ Baịbụl KJV Jiri Ọnụọgụgụ Strong — Ajụjụ Baịbụl
For each reference below, choose what that verse teaches. Your score appears at the end.
This is the graded quiz. Pass it to earn credit toward your Ministry Certificate of Endorsement.
Ọrụ Ndị Ozi 2:36 — “Ya mere, ana m eme ka ezinaụlọ Izrel niile mara nke ọma, na Chineke emeela Jisọs a onye unu kpọgidere ________ ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst.”
guzosie
isiala
nʼobe
Ndị Rom 5:8 — Ma lee ka ________ Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrịị na-eme mmehie, Kraịst nwụrụ nʼihi anyị.
nzọpụta
ịhụnanya
ọcha
Ndị Efesọs 1:7 — Nʼime ya, anyị nwere ________ site nʼọbara ya, bụ mgbaghara nke njehie niile anyị; dị ka ịba ụba nke amara ya si dị
ikike
mkpagbu
mgbapụta
Jọn 19:34 — Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ________ mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara.
ùbe
ekwensu
efu
Ọrụ Ndị Ozi 2:38 — Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ unu niile. Ka e mekwa unu baptizim nʼaha Jisọs Kraịst, maka ________ mmehie unu. Unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ.
mgbaghara
nkwuwa
mkpagbu
Ọrụ Ndị Ozi 3:19 — Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ ________ unu
mmehie
uwe
pụtara
Luk 13:3 — Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-esi otu ahụ laa ________.
ebere
ọnwụ
nʼiyi
2 Ndị Kọrint 7:10 — Nʼihi na iru ụjụ otu Chineke chọrọ na-eweta nchegharị nke na-eduba mmadụ na nzọpụta, bụ nchegharị nke a na-apụghị ịkwa ụta banyere ya. Ma iru ụjụ dịka ụwa si eme na-eweta ________.
ọnwụ
nʼiyi
ọṅụ
Ọrụ Ndị Ozi 22:16 — Ma ugbu a, gịnị ka ị na-eche? Bilie ọtọ, ka e mee gị ________, ka a sachakwa gị site na mmehie, na-akpọkukwa aha ya.’
nʼọnwụ
baptizim
oziọma
Ndị Rom 6:4 — Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ________.
mkpọrọ
ọhụrụ
nzukọ
Ndị Kọlọsị 2:12 — Mgbe e likọtara unu na ya na ________, e sitere nʼọnwụ kpọlite unu na ya site nʼokwukwe ahụ dị nʼike Chineke onye sitere nʼọnwụ kpọlite ya.
onyeozi
nʼokpuru
baptizim
1 Pita 3:21 — Mmiri a nọ ọnọdụ dị ka baptizim nke na-azọpụta unu ugbu a. Ọ anaghị asapụ unyi site nʼahụ mmadụ, kama ọ bụ ihe na-egosi ezi ________ nʼebe Chineke nọ. Ọ na-azọpụta unu site na mbilite nʼọnwụ nke Jisọs Kraịst
ọnwụnwa
ịhụnanya
akọnuche
Mak 16:16 — Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara ________ ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe.
baptizim
nʼọnwụ
nʼobe
Jọn 3:5 — Ma Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na ________ Nsọ, o nweghị ike ịba nʼalaeze Chineke.
mkpụrụ
nụrụ
Mmụọ
Ndị Galeshịa 3:27 — Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere ________ nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst.
baptizim
nʼọnwụ
akara
Ndị Efesọs 1:13 — Unu bụkwa ndị a gụnyere nʼime Kraịst mgbe unu nụrụ ozi nke eziokwu ahụ bụ oziọma nke ________. Mgbe unu kwenyere, a kara unu akara nʼime ya bụ akara nke nkwa ahụ bụ Mmụọ Nsọ.
pụrụ
nzọpụta
nʼụlọnsọ
1 Jọn 1:9 — Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ________ obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile.
nʼeluigwe
ngwangwa
ntụkwasị
Jọn 15:4 — Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka ________ ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị nʼime m.
alaka
ekwensu
nʼofe
Mkpughe 2:10 — Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, ọ bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị ________ ahụ, bụ ndụ.
eziokwu
okpueze
nwantakịrị
1 Jọn 2:1 — Ezi ________ m, ana m edere unu ihe ndị a ka unu ghara imehie. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla emehie, anyị nwere onye na-ekwuchite ọnụ anyị nʼihu Nna ahụ. Ọ bụ Jisọs Kraịst, Onye ezi omume ahụ.
nʼiwu
nkwa
ụmụntakịrị
Ndị Hibru 7:25 — Ya mere o nwere ike ịzọpụta ruo mgbe niile ndị ahụ na-abịakwute Chineke site na ya, nʼihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe niile ịrịọ ________ nʼihi ha.
ekele
arịrịọ
oziọma
Abụ Ọma 103:12 — Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka ________ anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.
mmehie
nsọ
nʼanya
Ndị Galeshịa 1:8 — A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere ________ bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ.
ịhụnanya
nʼeluigwe
Ngwangwa
Link copied
Has this study helped you? Share a short or your full testimony — your story helps someone else find this site.
Save your progress
Optional. You never need an account to use this site.
Keep your quiz scores and your certificate if you change phone or clear your browser.
Restore progress
Restoring replaces the progress on this device, and any certificate you print afterwards will carry the name on the record.
