🌐 Language
'Olelo Hawai'iAfaan Oromoobahasa IndonesiaBelarusianBrezhonegCebuanoChamorroChichewachiShonaChongthuCiyawoDanskDeutschEestiEnglishEspañolEsperantoeʋegbeFrançaisHausaHrvatskiIgboIlocanoItalianoKikuyuKiswahiliKiyombiKreyòl AyisyenLatinaLatviešulietuviųLingálaLugandaMagyarMahasuiMāoriNederlandsNorskPohnpeianPolskiPortuguêsQach’abelRomaniRomânăSanskritSetswanaShqipsrpski jezikSuomiSvenskaTagalogTiếng ViệtTonganTwiTürkçeUyghur tiliYorùbáÍslenskaČeštinaБългарскиРусскийУкраїнськаעבריתاردوالعربيةفارسیكوردی سۆرانیअहिराणी‎नेपालीभद्रवाही‎मराठीमानक हिन्दी‎हरियाणवी‎অসমীয়াবাংলাਪੰਜਾਬੀગુજરાતીଓଡ଼ିଆ‎தமிழ்తెలుగుಕನ್ನಡമലയാളംไทยဗမာἙλληνική中文日本語한국어+ Asụsụ Niile
See More Jesus
Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ebere? — Ibi Ya Ndụ · Akụkụ Baịbụl KJV Ndị Nwere Nọmba Strong — Ajụjụ Baịbụl

Ajụjụ Baịbụl

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ebere? — Ibi Ya Ndụ · Akụkụ Baịbụl KJV Ndị Nwere Nọmba Strong — Ajụjụ Baịbụl

Maka nkọwa ọ bụla dị n'okpuru, họrọ ihe amaokwu ahụ na-akụzi. Akara gị ga-apụta na njedebe.

Nke a bụ ajụjụ a na-enye akara. Gafee ya iji nweta ihe ga-abara gị uru banyere Asambodo Nkwado Ozi Gị.

Matiu 9:27 — Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-apụ, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru ìsì sooro ya. Ha tikuru ya mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere anyị ________!”
ebere
ekpere
nʼobi
Matiu 15:22 — Nʼebe ahụ, otu nwanyị onye ________ bi nʼobodo ahụ bịakwutere ya rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nwa Devid, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nʼime ya nke na-esogbu ya oge niile.”
Ifrem
Kenan
Sameria
Aịzaya 30:18 — Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya, ka o gosi unu ịhụnanya ya. O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya ________ ya.
arịrịọ
inyeaka
ure
Ọnụọgụgụ 6:24 — “‘ “Onyenwe anyị ________ unu ma chebe unu
chọọ
ọnwụ
gọzie
Abụ Ọma 145:9 — Onyenwe anyị dị mma nʼebe mmadụ niile dị; o nwere ọmịiko nʼebe ihe niile o ________ eke dị.
kere
inyeaka
ikwesi
Aịzaya 49:15 — “Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara, hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si ________ ya? Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ, ma agaghị m echezọ unu.
abalị
nghọta
nʼafọ
Jeremaya 31:20 — ________, ọ bụghị nwa m nwoke, onye ihe ya na-atọ m ụtọ? Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya, ma anọkwa m na-echeta ya. Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike. Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Edọm
Ifrem
Benjamin
1 Ndị Eze 3:26 — Nwanyị ahụ nwa ya dị ndụ jupụtara nʼọmịiko nʼebe nwa ya nọ, ọ gwara eze sị, “Biko, onyenwe m, kunye ya ________ ahụ dị ndụ. Egbukwala ya.” Ma onye nke ọzọ sịrị, “Kpọwaa ya abụọ. Nwa a agaghị abụ nke gị, ọ gaghị abụkwa nke m.”
nwantakịrị
nʼugwu
ndagwurugwu
Luk 15:20 — Ya mere, o biliri laghachikwuru nna ya. “Ma mgbe ọ nọrịị nʼebe dị anya, nna ya hụrụ ya, ________ ọmịiko nʼahụ ya, gbaara ọsọ ga makụọ ya, sutukwa ya ọnụ.
agụụ
nwee
abalị
Diuteronomi 7:9 — Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị bụ Chineke unu bụ Chineke. Ọ bụ Chineke kwesiri ntụkwasị obi, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya ruo puku ________, nye ndị niile hụrụ ya nʼanya, ndị na-edebe ihe niile o nyere nʼiwu.
ọgbọ
esemokwu
ite
1 Ndị Eze 8:23 — kwuo sị, “Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe nke dị nʼelu, maọbụ nʼụwa, nʼokpuru eluigwe. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ________ gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị.
ịhụnanya
ọcha
ọṅụ
Abụ Ọma 89:28 — Aga m eme ka ________ m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi, ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa.
ịhụnanya
mmehie
ukwuu
Abụ Ọma 89:33 — ma agaghị m ewezuga ________ m, nʼebe ha nọ. Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m.
ịhụnanya
ukwuu
ikwesi
Aịzaya 54:10 — Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile, wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha, ma obi ________ m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ, agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,” ka Onyenwe anyị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru.
ebere
mmehie
ebube
Abụ Ọma 85:10 — Ịhụnanya na ________ ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ.
mgbapụta
mbara
ikwesi
Abụ Ọma 25:10 — ________ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya.
Ụzọ
nsọ
nʼanya
Abụ Ọma 103:13 — Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị ________ egwu ya nọ
udo
mara
na-atụ
Luk 6:36 — Nweenu obi ebere dị ka Nna unu si ________ obi ebere.
mmehie
nwee
ohi
Ndị Kọlọsị 3:12 — Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị ________, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi.
nkasiobi
umeala
mgbapụta
Ndị Filipai 2:1 — Ya mere, ọ bụrụ na e nwere ________ ọbụla dịrị anyị nʼihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere inyeaka ọbụla site nʼịhụnanya ya, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọbụla anyị na Mmụọ na-enwekọ, ọ bụrụ na unu nwere obi nro na ọmịiko
ntachiobi
umeala
nkasiobi
Ndị Rom 12:1 — Ya mere, ________ m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.
ebube
ihere
ụmụnna
Ndị Rom 6:13 — Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi ________ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume.
oziọma
nkwa
nʼọnwụ
1 Samuel 17:47 — Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na Onyenwe anyị adịghị eji mma agha maọbụ ________ azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke Onyenwe anyị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.”
mwụda
mkpu
ùbe
Nehemaya 4:14 — Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, “Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ________ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha.”
nʼọnọdụ
ekpere
ezinaụlọ
Luk 7:13 — Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o meere ya obi ________ ma sị ya, “Ebela akwa.”
ekpere
ọcha
ebere
Jemis 5:11 — Anyị na-agụ ha ugbu a dịka ndị a gọziri agọzi nʼihi iguzosike ha. Unu anụla maka ogologo ________ nke Job nwere, unu ahụkwala nzube Onyenwe anyị nʼihi na Onyenwe anyị jupụtara nʼebere na ọmịiko.
umeala
nkasiobi
ntachiobi
Ndị Galeshịa 6:2 — Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ________ unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
kpọrọ
ibe
nʼanya
Jemis 5:16 — Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ________.
uru
mkpa
ire
1 Ndị Tesalonaịka 5:11 — Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ________ unu elu dị ka unu si eme.
Kraịst
nʼanya
ibe

← Laghachi n'ọmụmụ ihe a